Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 48:4-13 Bible Nso (IGBOB)

4. N'ihi na, le, ndi-eze zukọro,Ha gabigara n'otù.

5. Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru;Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.

6. Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu;Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.

7. I ji ifufe Iru-anyanwuTiwa ub͕ọ nile nke Tashish.

8. Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworoN'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi:Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah

9. Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke,N'etiti ulo uku Gi.

10. Dika aha-Gi si di, Chineke,Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa:Ezi omume juputara aka-nri-Gi.

11. Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu,Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù,N'ihi ikpé-Gi nile.

12. Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu:Guanu ulo-elu-ya nile ọnu.

13. Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya,Tulenu ulo nile ya di elu;Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 48