Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 48:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.

4. N'ihi na, le, ndi-eze zukọro,Ha gabigara n'otù.

5. Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru;Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.

6. Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu;Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.

7. I ji ifufe Iru-anyanwuTiwa ub͕ọ nile nke Tashish.

8. Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworoN'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi:Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah

9. Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke,N'etiti ulo uku Gi.

10. Dika aha-Gi si di, Chineke,Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa:Ezi omume juputara aka-nri-Gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 48