Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 48:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku,N'obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya.

2. Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile,Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu,Bú obodo Eze ukwu.

3. Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.

4. N'ihi na, le, ndi-eze zukọro,Ha gabigara n'otù.

5. Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru;Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.

6. Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu;Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 48