Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 47:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka;Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke.

2. N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu;Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.

3. Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi,Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi.

4. Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi,Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah

5. Chineke ewerewo iti-nkpu rigo,Jehova ewerewo olu opì-ike rigo.

6. Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma:Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma.

7. N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu:Bùkuenu Ya abù ọma, maschil.

8. Chineke aghọwo eze mba nile:Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 47