Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 45:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Àkú-gi nile bu ihe di nkọ;Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi;Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze.

6. Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi:Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka-eze nke ala-eze-Gi bu.

7. I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì:N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere giManu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi.

8. Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile;Site n'ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu.

9. Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia:Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.

10. Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala;Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 45