Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 45:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Obim ab͕ọputawo okwu di nma:Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze:Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa.

2. Emewo gi ka i ma nma kari umu madu;Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua:N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.

3. Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike,Ebube-gi na ima-nma-gi.

4. N'ima-nma-gi nọkwasi n'elu inyinya ga nke-ọma,N'ihi ezi-okwu na ume-ala-n'obi na ezi omume:Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu.

5. Àkú-gi nile bu ihe di nkọ;Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi;Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 45