Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 44:20-24 Bible Nso (IGBOB)

20. Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi,We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi;

21. Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a?N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.

22. N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile;Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.

23. Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi?Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi.

24. N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi?N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 44