Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 41:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu;Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe:Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya.

7. Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem:N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ.

8. Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru:E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ.

9. Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim,Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.

10. Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie,Ka m'we kwughachi ha ugwọ.

11. Nka ka m'ji mara na ihem nātọ Gi utọ,N'ihi na onye-irom adighi-eti nkpu nmeri n'arum.

12. Ma mu onwem, n'izu-okèm ka I jideworom,We me ka m'guzosie ike n'iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 41