Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 41:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike:N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.

2. Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n'uwa;Enye-kwa-la ya n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya.

3. Jehova gākwagide ya n'elu ihe o ji edina mb͕e aru nādighi ya ike:Ihe-ndina-ya nile ka I b͕anweworo n'ọria ya.

4. Mu onwem siri, Jehova, merem amara:Me ka nkpuru-obim diri ndu; n'ihi na emehiewom megide Gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 41