1. Elesirim anya Jehova ike;Ọ we tọrọm nti-Ya n'ala, nu ntikum.
2. Ọ we me ka m'si n'olùlù nbibi, n'apiti nke ala urọ, rigoputa;Ọ we me ka ukwum abua guzo n'elu nkume di elu, Ọ nēme ka nzọ-ukwum nile guzosie ike.
3. Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi:Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi.
4. Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya,Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n'uzọ okwu-ugha.