Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 39:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari:N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara:Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.

7. Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m'leworo anya gini?Ncherem, n'ebe I nọ ka ọ di.

8. Naputam n'aka njehiem nile:Emelam ka m'buru ihe-ita-uta nke onye-nzuzu.

9. Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum;N'ihi na Gi onwe-gi mere ya.

10. Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi:Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi.

11. I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n'ihi ajọ omume,I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla:N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu. Selah

12. Nuru ekperem, Jehova, ṅa kwa nti ntikum;Ab͕ala nkiti n'anya-mirim:N'ihi na ọbìa ka m'bu n'ebe I nọ,Abum onye-nnọdu, dika nnam-hà nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 39