Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 39:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Asirim, Ka m'lezie uzọm nile anya,Ka m'we ghara iwere irem mehie:Ka m'debere ọnum ihe ikechi ọnu,Mb͕e onye nēmebi iwu nọ n'irum.

2. Aghọrọm onye-ob͕i n'inọ-dū, ab͕aram nkiti, ọbuná ipu n'ikwu ezi ihe;Ewe kpalie ihe-nb͕um.

3. Obim di ọku nimem;Mb͕e m'nātughari uche ọku rebere:M'we were irem kwue okwu:

4. Jehova, me ka m'mara ọgwugwum,Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu;Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi.

5. Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka;Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi:N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah

6. N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari:N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara:Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 39