Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 38:5-21 Bible Nso (IGBOB)

5. Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri,N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ.

6. Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku;Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe.

7. N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku;Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum.

8. Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku:Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.

9. Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di;Ize-umem ezonarighi kwa Gi.

10. Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum.

11. Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.

12. Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà;Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche,Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.

13. Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe;Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.

14. E, adim ka madu nke nādighi-anu iheOnye iba-nba ọ bula nādighi n'ọnu-ya.

15. N'ihi na Gi, Jehova, ka m'chereworo:Gi onwe-gi gāza, Onye-nwe-ayi, Chinekem.

16. N'ihi na asirim, Ka ha ghara iṅuri ọṅu n'arum:Mb͕e anēwezuga ukwum n'ọnọdu-ya, ha mere onwe-ha ka ha di uku imegidem.

17. N'ihi na mu owem gaje ije nsukwra-achi,Ihe-nb͕um di kwa na ncherita-irum mb͕e nile.

18. N'ihi na m'gēgosi ajọ omumem;M'gēcheb͕u onwem bayere nmehiem.

19. Ma ndi-irom nādi ndu, nwe ume:Ha ba-kwa-ra uba, bú ndi nākpọm asì n'uzọ okwu-ugha.

20. Ndi ahu kwa nke nākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi iheNēmegidem, n'ihi na anamab͕aso ezi ihe.

21. Arapulam, Jehova:Chinekem, anọlam n'ebe di anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 38