Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 38:2-13 Bible Nso (IGBOB)

2. N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom,Aka-Gi adakwasiwokwam.

3. Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi;Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem.

4. N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim:Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.

5. Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri,N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ.

6. Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku;Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe.

7. N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku;Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum.

8. Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku:Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.

9. Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di;Ize-umem ezonarighi kwa Gi.

10. Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum.

11. Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.

12. Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà;Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche,Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.

13. Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe;Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 38