1. Jehova, abalaram nba n'iwe-Gi:Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.
2. N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom,Aka-Gi adakwasiwokwam.
3. Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi;Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem.
4. N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim:Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.
5. Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri,N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ.