1. Ihe nke nāputa n'ọnu njehie nke onye nēmebi iwu nāsi n'etiti obimỌ dighi oké egwu Chineke di n'anya-ya abua.
2. N'ihi na ọ nāgwa onwe-ya okwu ire-utọ n'anya onwe-ya,Bayere ichọputa ajọ omume-ya na ikpọ ya asì.
3. Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ:Ọ rapuwo inwe uche na ime nma.