Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 36:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ihe nke nāputa n'ọnu njehie nke onye nēmebi iwu nāsi n'etiti obimỌ dighi oké egwu Chineke di n'anya-ya abua.

2. N'ihi na ọ nāgwa onwe-ya okwu ire-utọ n'anya onwe-ya,Bayere ichọputa ajọ omume-ya na ikpọ ya asì.

3. Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ:Ọ rapuwo inwe uche na ime nma.

4. Ajọ ihe ka ọ nēchè n'elu ihe-ndina-ya;Ọ nēguzo onwe-ya n'uzọ nke nādighi nma;Ọ dighi-aju ihe ọjọ.

5. Jehova, n'elu-igwe ka ebere-Gi di;Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé.

6. Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke;Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne:Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova.

7. Le ka ebere-Gi si di oké ọnu-ahia, Chineke!Umu madu nāb͕abá kwa n'okpuru ǹdò nkù-Gi abua.

8. Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi;Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua.

9. N'ihi na n'ebe I nọ ka isi-iyi ndu di:N'ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè.

10. Me ka ebere-Gi digidere ndi mara Gi;Me kwa ka ezi omume-Gi digidere ndi ziri ezi n'obi.

11. Ekwela ka ukwu npako biakwasim,Ekwe-kwa-la ka aka nke ndi nēmebi iwu me ka m'wagharia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 36