Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 34:2-15 Bible Nso (IGBOB)

2. Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi:Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu.

3. Sonum me ka Jehova di uku,Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù.

4. Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram,We naputam n'ujọm nile.

5. Ha legidere Ya anya, we nwue enwu:Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru.

6. Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya,We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya.

7. Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya,Ọ we dọputa ha.

8. Detunu ire, hu na Jehova di nma:Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.

9. Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya:N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya.

10. Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha:Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.

11. Bianu, umum, gem nti:Egwu Jehova ka m'gēzi unu.

12. Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ,Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?

13. Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ,chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ.

14. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.

15. Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume,Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 34