Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 32:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem:M'siri, M'gēkwuputara Jehova njehiem nile;Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem. Selah

6. N'ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi:N'ezie n'iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru.

7. Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m'pua n'ahuhu;Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu. Selah

8. M'gēme ka i nwe uche, M'gēzi kwa gi ihe n'uzọ nke i gēje ije nime ya:M'gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n'aru.

9. Unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule, nke ọ dighi nghọta ha nwere:Agēji kwa bit na bridle, dika ihe-ekike, ijide ha,Ma emeghi otú a ha agaghi-abiaru nso gi.

10. Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu:Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 32