Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 31:4-20 Bible Nso (IGBOB)

4. I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta;N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike.

5. N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe:I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.

6. Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama:Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.

7. Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi:N'ihi na I huwo nweda-n'alam;I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche:

8. I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro;I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.

9. Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u:Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.

10. N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume:Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri.

11. N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku,Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu:Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom.

12. Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu:Aghọwom ihe nāla n'iyì.

13. N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu,Ujọ dim buruburu:Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem,Ha zubere iwepu ndum.

14. Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova:Asiwom, Chinekem ka I bu.

15. N'aka-Gi ka mb͕em nile di:Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um.

16. Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè:Zọputam n'ihi ebere-Gi.

17. Jehova, ekwela ka ihere mem; n'ihi na akpọkuwom I:Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n'ala-mọ.

18. Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i;Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume,Nime npako na nleda-anya.

19. Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi,Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu!

20. I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu:I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 31