Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 31:2-11 Bible Nso (IGBOB)

2. Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa:Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam.

3. N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu;Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo.

4. I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta;N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike.

5. N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe:I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.

6. Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama:Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.

7. Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi:N'ihi na I huwo nweda-n'alam;I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche:

8. I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro;I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.

9. Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u:Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.

10. N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume:Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri.

11. N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku,Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu:Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 31