Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 31:19-23 Bible Nso (IGBOB)

19. Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi,Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu!

20. I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu:I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche.

21. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu:N'ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n'ebe m'nọ n'obodo ewusiri ike.

22. Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi:Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi.

23. Hunu Jehova n'anya, ndi-ebere-Ya nile:Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi,Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 31