Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 29:2-10 Bible Nso (IGBOB)

2. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya;Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.

3. Olu Jehova di n'elu miri:Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe,Jehova nọ n'elu ọtutu miri.

4. Olu Jehova nāda n'ike;Olu Jehova nāda n'ima-nma.

5. Olu Jehova nētiwa osisi cedar;Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.

6. Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi;Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.

7. Olu Jehova nāwaputa ire ọku.

8. Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu;Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.

9. Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele,Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia:Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube.

10. Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu;Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 29