Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 29:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Nyenu Jehova, unu umu Chineke,Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

2. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya;Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.

3. Olu Jehova di n'elu miri:Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe,Jehova nọ n'elu ọtutu miri.

4. Olu Jehova nāda n'ike;Olu Jehova nāda n'ima-nma.

5. Olu Jehova nētiwa osisi cedar;Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.

6. Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi;Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 29