Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 28:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu,Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe;Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo,Ma ihe ọjọ di n'obi-ha.

4. Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di:Nye ha dika aka-ha si eme;Nyeghachi ha ihe ha mere.

5. N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova,Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo,Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.

6. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu,N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile.

7. Jehova bu ikem na ọtam;Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka:Obim we nāwuli elu n'ọṅù;M'gēsite kwa n'abùm kele Ya.

8. Jehova buru ya ike,Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 28