1. Gi, Jehova, ka m'nākpọku;Oké nkumem, echila nti n'ebe m'nọ:Ka I we ghara ib͕am nkiti,M'we yie ndi nārida n'olùlù.
2. Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi,Mb͕e m'chiliri akam abua n'ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di.
3. Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu,Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe;Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo,Ma ihe ọjọ di n'obi-ha.
4. Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di:Nye ha dika aka-ha si eme;Nyeghachi ha ihe ha mere.
5. N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova,Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo,Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.
6. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu,N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile.