Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 27:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. Ezonarilam iru-Gi;Ejila iwe wezuga orù-Gi:Iye-akam ka I buworo;Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam.

10. N'ihi na nnam na nnem arapuwom,Ma Jehova gēkubatam.

11. Jehova, zím uzọ-Gi;Durukwam n'okporo-uzọ di lari,N'ihi ndi nēchem anwu.

12. Enyelam n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um:N'ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume.

13. M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma JehovaN'ala ndi di ndu?

14. Nēle anya Jehova:Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume;E, nēle anya Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 27