Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 27:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu;M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya;M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.

7. Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù:Me-kwa-ram amara, zakwam.

8. Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum;Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.

9. Ezonarilam iru-Gi;Ejila iwe wezuga orù-Gi:Iye-akam ka I buworo;Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam.

10. N'ihi na nnam na nnem arapuwom,Ma Jehova gēkubatam.

11. Jehova, zím uzọ-Gi;Durukwam n'okporo-uzọ di lari,N'ihi ndi nēchem anwu.

12. Enyelam n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um:N'ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume.

13. M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma JehovaN'ala ndi di ndu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 27