12. Enyelam n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um:N'ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume.
13. M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma JehovaN'ala ndi di ndu?
14. Nēle anya Jehova:Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume;E, nēle anya Jehova.