Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 27:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu?Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu?

2. Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum,Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n'ala.

3. Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem,Obim agaghi-atu egwu:Ọ buru na agha ebilie imegidem,Na nka ka mu onwem nātukwasi obi.

4. Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ;Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum,Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.

5. N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ:Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya;N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu.

6. Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu;M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya;M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.

7. Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù:Me-kwa-ram amara, zakwam.

8. Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum;Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 27