Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 26:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Mu na madu efu anọkọghi;Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.

5. Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì,Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.

6. Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ;We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:

7. Ime ka ege nti olu ekele,Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

8. Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya,Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.

9. Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù,Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù:

10. Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha,Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 26