Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 26:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm:Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.

2. Nwà m, Jehova, nwaputakwam;Nucha akurum abua na obim.

3. N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam;Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi.

4. Mu na madu efu anọkọghi;Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.

5. Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì,Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.

6. Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ;We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:

7. Ime ka ege nti olu ekele,Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

8. Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya,Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.

9. Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù,Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 26