Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 25:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim.

2. Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi,Ekwela ka ihere mem;Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.

3. Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha:Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu.

4. Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile;Zím okporo-uzọ-Gi nile.

5. Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe;N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam;Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.

6. Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile;N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo.

7. Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile:Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam,N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.

8. Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu:Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ.

9. Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé:Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya.

10. Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwuN'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.

11. N'ihi aha-Gi, Jehova,B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.

12. Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova?O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa.

13. Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma,Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.

14. Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.

15. Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile;N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 25