Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 24:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova nwe uwa na ùjú-ya;Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.

2. N'ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n'elu oké osimiri nile,Me kwa ka o guzosie ike n'elu osimiri nile.

3. Ònye gārigo n'ugwu Jehova?Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya?

4. Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha;Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu,Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.

5. Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova,Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.

6. Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya,Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob. Selah

7. Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:Eze ebube gābata kwa.

8. Ònye kwa bu Eze ebube a?Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike,Ọ bu Jehova, Nke bu dike n'agha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 24