Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 22:24-30 Bible Nso (IGBOB)

24. N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú;O zonarighi kwa ya iru-Ya;Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.

25. N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba:M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya.

26. Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ:Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya:Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

27. Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova:Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi.

28. N'ihi na ọ bu Jehova nwe ala-eze:Ọ nāchi kwa mba nile.

29. Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala:N'iru Ya ka ndi nile ndi nārida n'ájá gēruru ala,Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu.

30. Otù nkpuru gēfè Ya òfùfè;Agākọrọ ọb͕ọ ọzọ akukọ a bayere Onye-nwe-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 22