14. Dika miri ka awusiworom,Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha:Obim aghọwo ihe dika wax;Ọ lọwo miri n'etiti afọm.
15. Ikem akpọwo nku di ka osisi;Irem nārapara kwa n'ab͕am;Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.
16. N'ihi na nkita dim buruburu:Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu;Ha nādupú akam abua na ukwum abua.
17. Anamagu ọkpukpum nile ọnu;Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:
18. Ha nēkère onwe-ha uwem,N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà.
19. Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya:Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.
20. Naputa nkpuru-obim na mma-agha;Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita.
21. Zọputam n'ọnu ọdum;Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.
22. Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi:N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi.
23. Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya;Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya;Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel.
24. N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú;O zonarighi kwa ya iru-Ya;Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.
25. N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba:M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya.