Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 2:2-11 Bible Nso (IGBOB)

2. Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha,Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù,Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,

3. Ka ayi tijie ab͕u nile ha,Tufue udọ̀ nile ha n'aru ayi.

4. Onye nānọdu n'elu-igwe nāchi ọchì:Onye-nwe-ayi nākwa ha emò.

5. Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n'iwe-Ya,Ọ bu kwa n'iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji:

6. Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ikeN'elu Zaion, bú ugwu nsọm.

7. M'gākọ akukọ bayere ukpuru:Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu;Mu onwem amuwo gi ta.

8. Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi,Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi.

9. I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha;Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.

10. Ma ub͕u a, ndi-eze, nwenu uche:Ka adọ unu aka na nti, ndi-ikpe nke uwa.

11. Werenu egwu fè Jehova òfùfè,Were-kwa-nu ọma-jijiji tegharia egwú ọṅù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 2