44. Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.
45. Ndi ala ọzọ nāta aru,Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta.
46. Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;Chineke nke nzọputam di kwa elu:
47. Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.
48. Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom:I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike.
49. N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba nile,Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.