Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 18:39-48 Bible Nso (IGBOB)

39. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.

40. Ndi-irom, I nyewokwam olu-haNdi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

41. Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.

42. Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe:Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.

43. I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdom onye-isi mba nile ọzọNdi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.

44. Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.

45. Ndi ala ọzọ nāta aru,Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta.

46. Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;Chineke nke nzọputam di kwa elu:

47. Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.

48. Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom:I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 18