Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 18:38-44 Bible Nso (IGBOB)

38. Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:Ha nāda n'okpuru ukwum abua.

39. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.

40. Ndi-irom, I nyewokwam olu-haNdi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

41. Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.

42. Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe:Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.

43. I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdom onye-isi mba nile ọzọNdi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.

44. Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 18