33. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.
34. O nēzi akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
35. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Aka-nri-Gi nākwagidekwam,Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
36. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
37. Anamachu ndi-irom, we rue ha aru:Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
38. Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:Ha nāda n'okpuru ukwum abua.