32. Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké,Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.
33. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.
34. O nēzi akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
35. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Aka-nri-Gi nākwagidekwam,Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.