Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 18:3-14 Bible Nso (IGBOB)

3. Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova:Ewe zọputam n'aka ndi-irom.

4. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu.

5. Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu:Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.

6. Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,Ọ bu Chinekem ka m'nētiku:O nēsi n'ulo uku Ya nu olum,Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.

7. Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji,Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.

8. Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya,Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia:Afunwuru icheku site na ya.

9. O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida;Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.

10. O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie:O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè.

11. Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu;Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.

12. Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara,Akú-miri-ígwé na icheku ọku.

13. Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe,Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da;Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.

14. O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 18