25. N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere;N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
26. N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á.
27. N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala;Ma anya npako, I gēme ka ha di ala.
28. N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam:Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
29. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe;Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi.
30. Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
31. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
32. Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké,Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.
33. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.
34. O nēzi akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
35. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Aka-nri-Gi nākwagidekwam,Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
36. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
37. Anamachu ndi-irom, we rue ha aru:Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
38. Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:Ha nāda n'okpuru ukwum abua.
39. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
40. Ndi-irom, I nyewokwam olu-haNdi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
41. Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.