Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 18:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim.

18. Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:Ma Jehova burum ihe-ndabere.

19. O we me ka m'puta rue ebe sara mbara;Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.

20. Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di;Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ.

21. N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova,Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem.

22. N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum,Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 18