Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 16:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Debem, Chineke: n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.

2. Asiwom Jehova, Onye-nwem ka I bu:Ọdi-nmam adighi-eru Gi aru.

3. Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa,Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ:

4. Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova:M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara,M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum.

5. Jehova bu òkè nke ihe m'ketara na ìkom:Gi onwe-gi nējide ihe rurum n'ife-nzà.

6. Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n'ebe di utọ;N'ezie ihe-nketam dim ezi nma.

7. M'gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu:Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n'abali nile.

8. Edowom Jehova n'irum mb͕e nile:N'hi na Ọ nọ n'aka-nrim, agaghi-ewzugam n'ọnọdum.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 16