Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 148:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi:Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.

7. Tonu Jehova site n'uwa,Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:

8. Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu:Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:

9. Ugwu nile na ugwu ntà nile;Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:

10. Anu-ọhia na anu-ulo nile;Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:

11. Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche;Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa:

12. Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ;Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:

13. Ka ha too aha Jehova;N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya:Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 148