Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 146:6-9 Bible Nso (IGBOB)

6. Onye meworo elu-igwe na uwa,Na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha;Onye nēdebe ezi-okwu rue mb͕e ebighi-ebi:

7. Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n'ikpe;Onye nēnye ndi agu nāgu nri:Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ;

8. Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì;Jehova nēkuli ndi nēruda n'ala;Jehova n'ahu ndi ezi omume n'anya;

9. Jehova nēdebe ndi ala ọzọ;Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ;Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 146