Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 146:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Tonu Ja.Nkpuru-obim, to Jehova.

2. M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile:M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.

3. Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha,Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.

4. Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n'ala o si puta;N'ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n'iyì.

5. Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka,Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya:

6. Onye meworo elu-igwe na uwa,Na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha;Onye nēdebe ezi-okwu rue mb͕e ebighi-ebi:

7. Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n'ikpe;Onye nēnye ndi agu nāgu nri:Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ;

8. Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì;Jehova nēkuli ndi nēruda n'ala;Jehova n'ahu ndi ezi omume n'anya;

9. Jehova nēdebe ndi ala ọzọ;Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ;Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 146