Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 144:3-14 Bible Nso (IGBOB)

3. Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya?Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?

4. Madu yiri otù nku-umeUbọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.

5. Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida:Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.

6. Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa;B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha.

7. Si n'elu setipu aka-Gi;Dọputam, naputakwam n'ọtutu miri,N'aka ndi ala ọzọ;

8. Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

9. Chineke, abù ọhu ka m'gābùku Gi:Une nke akwara iri ka m'gēji bùkue Gi abù ọma.

10. Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa:Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ.

11. Dọputam, nāputakwam n'aka ndi ala ọzọ,Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

12. Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n'ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata;Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku;

13. Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche;Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n'èzí nile ayi;

14. Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma;Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di,Ọ dighi kwa iti-nkpu di n'amá nile ayi;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 144